14Devid kpọrọ Abna nwa Nea na ndị agha oku sị, “Abna, za m oku!” Abna jụrụ ya sị, “Onye ka ị bụ i ji si otu a na-eti mkpu ịkpọte eze?”
15Devid sịrị, “Nʼezie, ọ bụghị nwoke ka ị bụ? Onye dịkwa ka gị nʼIzrel niile? Gịnị mere i ji hapụ ichezi onyenwe gị eze nke ọma? Otu onye bịara igbu onyenwe gị, bụ eze.
16Ihe a i mere adịghị mma. Nʼeziokwu, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, gị na ndị ikom gị kwesiri ọnwụ, nʼihi na gị na ndị gị echebeghị onyenwe unu, bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ebee ka ùbe eze, na ihe mmiri ọṅụṅụ ya, nke dị nʼakụkụ isi ya dị?”
17Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ olu Devid, ọ sịrị, “Ọ bụ gị nwa m, Devid?” Devid zara sị ya, “E, ọ bụ olu m, onyenwe m, eze.”
18Ọ sịkwa, “Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achụgharị ohu ya? Gịnị ka m mere? Gịnịkwa bụ ihe ọjọọ ị chọtara nʼaka m?