3Nʼoge a Samuel anwụọla, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, lie ya nʼobodo ya bụ Rema. Sọl achụpụsịakwala ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase na ndị dibịa afa site nʼala ahụ.
4Ndị Filistia zukọtara, bịa maa ụlọ ikwu ha na Shunem, ebe Sọl na ndị Izrel niile zukọtakwara maa ụlọ ikwu ha na Gilboa.
5Mgbe Sọl hụrụ igwe ndị agha ndị Filistia, oke ụjọ jidere ya.
6Ọ jụrụ Onyenwe anyị ase, ma Onyenwe anyị azaghị ya. Ọ zaghị na nrọ, maọbụ site nʼUrim, maọbụ site nʼọnụ ndị amụma.
7Mgbe ahụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi, “Chọtara m nwanyị onye na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, ka m gakwuru ya jụta ya ase.” Ha sịrị, “E nwere otu nwanyị dị otu a nʼEndoa.”