1 Samuel 4

Okwu Samuel rutere ndị Izrel niile ntị. Mgbe Izrel pụrụ izute ndị Filistia nʼagha, ha mara ụlọ ikwu ha na Ebeneza, ma ndị Filistia mara nke ha nʼAfek.

1 Samuel 4:1 (UKJV) And the word of Samuel came to all Israel. Now Israel went out against the Philistines to battle, and pitched beside Ebenezer: and the Philistines pitched in Aphek.

1Okwu Samuel rutere ndị Izrel niile ntị. Mgbe Izrel pụrụ izute ndị Filistia nʼagha, ha mara ụlọ ikwu ha na Ebeneza, ma ndị Filistia mara nke ha nʼAfek.

2Nʼagha a lụrụ nʼụbọchị ahụ, ndị Filistia doro onwe ha nʼusoro izute ndị Izrel, dịka agha na-agbasa, ndị Filistia lụgburu ụmụ Izrel, gbukwaa puku mmadụ anọ nʼime ha.

3Mgbe ndị agha Izrel fọdụrụ laghachiri nʼụlọ ikwu ha, ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji kwe ka ndị Filistia merie anyị taa. Ka anyị gaa Shaịlo buputa igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ka o soro anyị jee agha, ka ọ napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.