10Ha were dịka okwu ndị a si dị. Ha weere nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide ha nʼụgbọala ahụ, werekwa ụmụ ha kpọchie nʼọgba anụ.
11Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ e tinyere oke na oyiyi etuto ọlaedo ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka ha dọkwasịrị nʼelu ụgbọala ahụ.
12Ehi ndị ahụ dọkpụrụ ụgbọ ahụ gawa nʼụzọ Bet-Shemesh. Ha na-ebekwa muuu mgbe ha na-aga. Ha sogidere ụzọ ahụ na-aga. Ha echigharịghị gaa aka nri maọbụ aka ekpe. Ndị eze ndị Filistia sogidekwara ha nʼazụ tutu rute nʼoke ala Bet-Shemesh.
13Nʼoge a, ndị Bet-Shemesh nọ nʼubi na-ewe ihe ubi nke ọka wiiti na ndagwurugwu ala ahụ. Mgbe ha lepụrụ anya hụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ọṅụ juru ha obi.
14Mgbe ụgbọala ahụ batara nʼubi nwoke a na-akpọ Joshua na Bet-Shemesh, ọ kwụsịrị nʼakụkụ otu nkume ukwu dị nʼebe ahụ. Ngwangwa, ndị nọ nʼebe ahụ gbuwasịrị osisi e ji mee ụgbọ ahụ, gbukwaa ehi abụọ ahụ, were ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.