1 Samuel 6

Onyinye etuto ọlaedo ise a kpụrụ akpụ nke ha nyere Onyenwe anyị dị ka aja ikpe ọmụma nʼihi ihe mere ha bụ maka obodo ndị Filistia ndị a, Ashdọd, Gaza, Ashkelọn, Gat na Ekrọn.

1 Samuel 6:17 (UKJV) And these are the golden emerods which the Philistines returned for a trespass offering unto the LORD; for Ashdod one, for Gaza one, for Askelon one, for Gath one, for Ekron one;

15Ndị ikom Livayị nọ nʼebe ahụ buliri igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ dị nʼakụkụ ya nke ọlaedo niile a kpụrụ akpụ dị nʼime ya, dọkwasị ha nʼelu nkume. Ndị Bet-Shemesh chụrụ ọtụtụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nye Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ.

16Mgbe ndị eze ise obodo ndị Filistia hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼEkrọn nʼụbọchị ahụ.

17Onyinye etuto ọlaedo ise a kpụrụ akpụ nke ha nyere Onyenwe anyị dị ka aja ikpe ọmụma nʼihi ihe mere ha bụ maka obodo ndị Filistia ndị a, Ashdọd, Gaza, Ashkelọn, Gat na Ekrọn.

18Ha wetakwara oke ọlaedo a dịka ọnụọgụgụ obodo ndị Filistia si dị, bụ nke ndịisi ise ahụ nwere, obodo ndị e wusiri ike, na obodo nta niile ha. Nkume ukwu ahụ ebe a dọkwasịrị igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, bụ ihe akaebe nʼubi Joshua, onye Bet-Shemesh ruo taa.

19Ma Onyenwe anyị tigburu iri ndị ikom asaa nʼetiti ndị Bet-Shemesh nʼihi na ha nyobara anya nʼime igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Nʼihi ya ndị Bet-Shemesh ruru ụjụ nʼihi ndị ahụ niile Onyenwe anyị tigburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.