9Mgbe ahụ, Samuel weere nwa atụrụ na-aṅụ ara jiri ya chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, rịọkwa Onyenwe anyị ka o nyere Izrel aka. Onyenwe anyị zara ekpere ya.
10Nʼoge ahụ, mgbe Samuel nọ na-esure aja nsure ọkụ ahụ, ndị Filistia bịaruru nso ibuso Izrel agha, ma Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe were oke olu egbe eluigwe nke dara oke ụda chụsasịa ha. O mere ka ọgbaaghara bata nʼetiti ndị Filistia. Nke a mekwara ka ụmụ Izrel kpochapụ ha,
11Ndị ikom Izrel si na Mizpa pụta chụso ndị Filistia ọsọ, na-etigbu ha nʼụzọ ruo na ndịda Bet-Ka.
12Mgbe ahụ, Samuel weere otu nkume doo ya nʼagbata Mizpa na Shen, kpọọ ebe ahụ, Ebeneza, nke pụtara, “Nkume inyeaka,” nʼihi na ọ sịrị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyerela anyị aka ruo ugbu a.”
13Ya mere, mmeri a e meriri ndị Filistia mere ka ha ghara ibuso Izrel agha ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị kwụsịrị ha ime nke a ụbọchị niile nke ndụ Samuel.