12Mgbe ahụ, Samuel weere otu nkume doo ya nʼagbata Mizpa na Shen, kpọọ ebe ahụ, Ebeneza, nke pụtara, “Nkume inyeaka,” nʼihi na ọ sịrị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyerela anyị aka ruo ugbu a.”
13Ya mere, mmeri a e meriri ndị Filistia mere ka ha ghara ibuso Izrel agha ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị kwụsịrị ha ime nke a ụbọchị niile nke ndụ Samuel.
14E nyeghachiri ndị Izrel obodo niile ndị Filistia dọtara nʼagha na mbụ, nke dị site nʼEkrọn ruo Gat. Ndị Izrel napụtara oke ala ndị a site nʼaka ndị Filistia. Nʼụzọ dị otu a, e mere ka udo dị nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọrait.
15Samuel nọgidere dịka onye ikpe ndị Izrel ụbọchị niile nke ndụ ya.
16Afọ niile, ọ na-ejegharị site nʼotu obodo ruo nʼobodo ọzọ, site nʼobodo Betel ruo Gilgal, ruokwa Mizpa. Ọ na-anọkwa nʼobodo ndị a na-ekpe ndị Izrel ikpe.