1 Samuel 7

Igbe ahụ dịgidere na Kiriat Jearim ogologo oge, iri afọ abụọ zuruoke. Ma nʼoge a niile, ndị Izrel nọ na-eru ụjụ nʼihi Onyenwe anyị.

1 Samuel 7:2 (UKJV) And it came to pass, while the ark abode in Kirjathjearim, that the time was long; for it was twenty years: and all the house of Israel lamented after the LORD.

1Ya mere, ndị ikom Kiriat Jearim bịara buru igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị bubata ya nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu. Ha doro Elieza, ọkpara Abinadab nsọ, ka ọ bụrụ onye na-elekọta igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

2Igbe ahụ dịgidere na Kiriat Jearim ogologo oge, iri afọ abụọ zuruoke. Ma nʼoge a niile, ndị Izrel nọ na-eru ụjụ nʼihi Onyenwe anyị.

3Ya mere, Samuel gwara ezinaụlọ Izrel niile sị, “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na alaghachikwute Onyenwe anyị, mgbe ahụ, wezuganụ chi niile nke ndị ala ọzọ, na arụsị Ashtọret site nʼetiti unu. Kpebienụ nʼobi unu ịbịakwute Onyenwe anyị, feekwa naanị ya ofufe. Ọ ga-anapụtakwa unu site nʼaka ndị Filistia.”

4Ya mere, ndị Izrel wezugara arụsị Baal na Ashtọret ha, bido ife naanị Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.