1Mgbe Samuel ghọrọ agadi, o mere ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị ikpe ndị Izrel.
2Juel, ọkpara ya, na Abija, nke na-eso ya ka ọ họpụtara. Ha nọkwa na Bịasheba na-ekpe ndị Izrel ikpe.
3Ma ụmụ ya esoghị ụzọ ya. Ha na-agbaso naanị ihe ga-abara ha. Ha na-erikwa ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.