1 Samuel 9

Samuel zara sị ya, “Mụ onwe m bụ ọhụ ụzọ ahụ. Gaanụ nʼihu m rigoruo nʼebe dị elu, nʼihi na mụ na unu ga-eso rikọọ nri taa. Nʼụtụtụ echi aga m agwa gị ihe dị gị nʼobi. Aga m ezilagakwa gị.

1 Samuel 9:19 (UKJV) And Samuel answered Saul, and said, I am the seer: go up before me unto the high place; for all of you shall eat with me to day, and tomorrow I will let you go, and will tell you all that is in yours heart.

17Mgbe Samuel hụrụ Sọl, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Lee nwoke ahụ m gwara gị ihe banyere ya! Ọ bụ ya ga-achị ndị m.”

18Ma Sọl bịaruru Samuel nso jụọ ya sị, “Biko, zi m ebe ụlọ onye ọhụ ụzọ dị.”

19Samuel zara sị ya, “Mụ onwe m bụ ọhụ ụzọ ahụ. Gaanụ nʼihu m rigoruo nʼebe dị elu, nʼihi na mụ na unu ga-eso rikọọ nri taa. Nʼụtụtụ echi aga m agwa gị ihe dị gị nʼobi. Aga m ezilagakwa gị.

20Enyela obi gị nsogbu maka ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu nʼabalị atọ gara aga, nʼihi na a chọtala ha. Ma, onye ka mmadụ ahụ bụ, onye ndị Izrel niile na-achọsi ike? Ọ bụghị gị na ezinaụlọ nna gị.”

21Ma Sọl zara sị, “Ọ bụghị onye Benjamin ka m bụ, onye sitere nʼebo kachasị nta nʼIzrel; ọ bụghị agbụrụ m dịkarịsịrị nta nʼetiti agbụrụ niile ọzọ dị nʼebo Benjamin? Gịnị mere i ji agwa m ụdị okwu dị otu a?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.