25Mgbe ha sitere nʼebe ahụ dị elu rịdata nʼobodo. Samuel kpanyere Sọl ụka nʼelu ụlọ ya.
26Nʼisi ụtụtụ mgbe ha biliri, Samuel kpọrọ Sọl nʼụlọ elu sị, “Jikere, ka m zilaga gị.” Mgbe Sọl kwadoro, ya na Samuel sooro pụọ nʼezi.
27Ka ha na-arịda na-abịaru nsọtụ obodo ahụ, Samuel sịrị Sọl, “Gwa onyeozi ahụ ka ọ gafee nʼihu anyị.” Onyeozi ahụ mekwara otu a, ma, “Gị onwe gị chere ntakịrị oge nʼebe a ka m mee ka ị nụrụ ozi sitere nʼaka Chineke.”