15Ndị gburu ndị amụma, gbukwaa Onyenwe anyị Jisọs. Ugbu a ha na-akpagbukwa anyị na-achụpụ anyị. Ha na-emegide Chineke na mmadụ niile
16site nʼigbochi anyị izisara ndị mba ọzọ oziọma ka a ghara ịzọpụta ha. Ha na-esite nʼụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịlarị ha.
17Otu ọ dị, ụmụnna anyị, mgbe anyị si nʼetiti unu pụọ, nọọ nwa oge nta, ọnọdụ a mere anyị ndị na-enweghị nne na nna (maọbụ na-anụ ahụ ọ bụghị nʼime mmụọ), nʼihi otu unu si gụọ anyị agụụ, anyị gbalịrị ihu unu.
18Anyị gbalịsịrị ike ịbịakwute unu, karịsịa, mụ onwe m bụ Pọl gbalịrị, gbalịa ịbịa, ma ekwensu gbochiri anyị.
19Nʼihi na olee ihe bụ olileanya anyị, maọbụ ọṅụ anyị, maọbụ okpueze anyị, nke anyị ga-eji nyaa isi mgbe a ga-eme ka anyị niile guzo nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, mgbe ọ ga-abịa? Ọ bụ na ọ bụghị unu onwe unu?