18Anyị gbalịsịrị ike ịbịakwute unu, karịsịa, mụ onwe m bụ Pọl gbalịrị, gbalịa ịbịa, ma ekwensu gbochiri anyị.
19Nʼihi na olee ihe bụ olileanya anyị, maọbụ ọṅụ anyị, maọbụ okpueze anyị, nke anyị ga-eji nyaa isi mgbe a ga-eme ka anyị niile guzo nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, mgbe ọ ga-abịa? Ọ bụ na ọ bụghị unu onwe unu?
20Nʼezie, unu onwe unu bụ ọṅụ na otuto anyị.