1 Ndị Tesalonaịka 3

Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu.

1 Thessalonians 3:10 (UKJV) Night and day praying exceedingly that we might see your face, and might perfect that which is lacking in your faith?

8Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị.

9Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu.

10Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu.

11Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu.

12Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.