11Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu.
12Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ.
13Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.