1 Ndị Tesalonaịka 3

Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu.

1 Thessalonians 3:7 (UKJV) Therefore, brethren, we were comforted over you in all our affliction and distress by your faith:

5Nʼihi nke a, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, eziri m ozi, ka a chọpụta maka okwukwe unu. Nʼihi na ụjọ m bụ ma eleghị anya o nweela ụzọ onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ si nwaa unu ọnwụnwa nʼoge a, mee ka ndọgbu niile anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ nʼetiti unu bụrụ ihe lara nʼiyi.

6Ma ugbu a, Timoti esitela nʼebe unu nọ lọghachikwute anyị. O wetara oziọma banyere okwukwe unu na ịhụnanya unu. O mekwara ka anyị mata na unu na-enwe ezi ncheta banyere anyị mgbe niile, na ọ na-agụsị unu agụụ ike ịhụ anyị anya, dị ka o si agụkwa anyị ịhụ unu anya.

7Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu.

8Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị.

9Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.