9Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesiri ịdị nʼetiti ụmụnna, o kwesighị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nʼihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke kuziri ka unu nwee ịhụnanya nʼebe ibe unu nọ.
10Ma nʼezie, unu na-ahụ ụmụnna anyị niile bi na Masidonia nʼanya. Ma anyị na-arịọsịkwa unu arịrịọ ike sị unu na-ahụkwa ha nʼanya karịa ka unu hụrụ ha ugbu a.
11Nweenụ agụụ ibi ndụ nwayọọ, na-arụkwanụ ọrụ dịịrị unu. Jirikwanụ aka unu na-arụ ọrụ dịka anyị gwara unu,
12nke a ga-eme ka ndụ unu na-ebi kwa ụbọchị wetara unu nsọpụrụ nʼebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, meekwa ka unu ghara i dabere nʼonye ọbụla.
13Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya.