14Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ.
15Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ.
16Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie.
17Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.
18Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-agba onwe unu ume mgbe niile.