1 Ndị Tesalonaịka 5

Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile.

1 Thessalonians 5:16 (UKJV) Rejoice evermore.

14Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ.

15Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ.

16Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile.

17Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka.

18Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.