22Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile.
23Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
24Onye ahụ kpọrọ unu ga-emezu ihe ndị a, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.
25Biko ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere.
26Werenụ isurita ọnụ dị nsọ na-ekele ụmụnna anyị dum.