1 Timoti 1

Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi.

1 Timothy 1:16 (UKJV) Nevertheless for this cause I obtained mercy, that in me first Jesus Christ might show forth all longsuffering, for a pattern to them which should hereafter believe on him to life everlasting.

14Ma Onyenwe anyị wụkwasịrị m amara ya, nke babigara ụba oke, ya na okwukwe na ịhụnanya nʼime Kraịst Jisọs.

15Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.

16Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi.

17Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

18Ugbu a, Timoti nwa m, ana m enye gị ndụmọdụ a dị ka amụma ahụ e buru banyere gị nʼoge gara aga si dị. Ka ị site nʼịgbaso ya nwe ike ịlụ ezi ọgụ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.