4Mee ka ha kwụsị ịkọ ogologo akụkọ, na inyocha ihe gbasara usoro ọmụmụ dị iche iche nke na-adịghị agwụ agwụ. Nʼihi na ihe ndị a na-eweta ajụjụ na ịrụ ụka na-abaghị uru, kama inyere ndị mmadụ aka ịnabata ụzọ ahụ Chineke kwadoro site nʼokwukwe.
5Ihe anyị bu nʼobi nye iwu a, bụ ka a kwalite ịhụnanya nke sitere nʼobi ọcha na ezi akọnuche, na okwukwe nke aghụghọ na-adịghị.
6Ụfọdụ e sikwala nʼihe ndị a dapụ, jehie ụzọ, site nʼoke ịrụ ụka na-abaghị uru.
7Ha chọrọ ịbụ ndị ozizi iwu ma ha amaghị ihe ha na-ekwu maọbụ ihe ha na-akwadosi ike.
8Ma anyị maara na iwu dị mma, ma ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ya mee ihe a chọrọ ka e jiri ya mee.