1 Timoti 3

Nʼihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkwuwa okwu ha nwere banyere okwukwe a nʼime Kraịst Jisọs.

1 Timothy 3:13 (UKJV) For they that have used the office of a deacon well purchase to themselves a good degree, and great boldness in the faith which is in Christ Jesus.

11Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile.

12Ndị niile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere naanị otu nwunye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinaụlọ nke aka ha nke ọma.

13Nʼihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkwuwa okwu ha nwere banyere okwukwe a nʼime Kraịst Jisọs.

14Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a.

15Asị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ, ị ga-amata otu ndị mmadụ kwesiri isi bie obi nʼezinaụlọ Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ntọala nke eziokwu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.