2 Ihe E Mere 1

A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ.

2 Chronicles 1:16 (UKJV) And Solomon had horses brought out of Egypt, and linen yarn: the king's merchants received the linen yarn at a price.

14Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ.

15Eze mere ka ọlaọcha na ọlaedo baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche

16A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ.

17Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii; jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.