19Ọ mụtaara ya ụmụ ndị ikom atọ ndị a: Jeush, na Shemaraya, na Zaham.
20Emesịa, ọ lụkwara nwunye ọzọ aha ya bụ Maaka, nwa nwanyị Absalọm. Ụmụ ha mụtara bụ Abija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.
21Rehoboam hụrụ Maaka nwa nwanyị Absalọm nʼanya karịa ndị nwunye ya na ndị iko ya nwanyị niile. O nwere ndị nwunye iri na asatọ, nweekwa iri ndị iko nwanyị isii. Ọ mụtara iri ndị ikom abụọ na asatọ, na iri ụmụ nwanyị isii.
22Rehoboam mere Abija nwa Maaka onyeisi nʼetiti ụmụ eze niile nʼihi na ọ chọrọ ime ya eze.
23O ji ezi uche zipụchaa ụmụ ya ndị ikom gaa nʼala ndị Juda na Benjamin, nakwa nʼobodo ndị ahụ e wusiri ike. O nyere ha ihe e ji elekọta ndụ nʼebe ọ bara ụba ma lụọkwara ha ọtụtụ ndị inyom.