3“Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na Izrel niile nọ na Juda na Benjamin,
4Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ndị Izrel ibe unu agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme ihe ndị a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu niile nke Onyenwe anyị. Ha tụgharịrị laghachi azụ nʼịga megide Jeroboam.
5Rehoboam bigidere na Jerusalem wusie obodo ndị dị na Juda ike nʼihi nchedo.
6Obodo ndị a bụ Betlehem, Etam, Tekoa,
7Bet Zoa, Soko, Adulam,