8Ma otu ọ dị, ha ga-abụrụ ya ohu, ka ha nwe ike mata ọ dị iche dị nʼetiti ijere m ozi na ijere ndị eze ala ọzọ dị iche iche ozi.”
9Mgbe Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem nʼagha; o bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo ndị ahụ Solomọn kpụrụ.
10Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya.
11Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-eso ya buru ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.
12Mgbe eze wedara onwe ya nʼala, iwe Onyenwe anyị na-eweso ya dajụrụ, Ọ laghịkwa ya nʼiyi kpamkpam. Nʼezie, ezi ihe fọdụkwara na Juda.