13Eze Rehoboam mere onwe ya ka ọ dị ike na Jerusalem na-achịkwa ka eze. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn.
14O mere ihe ọjọọ, nʼihi na ọ dịghị mgbe ọbụla o kpebiri nʼobi ya ịchọ Onyenwe anyị.
15Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Shemaya onye amụma na nke Ido onye ọhụ ụzọ, nke na-ahụ maka ihe banyere usoro ọmụmụ niile? Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha.
16Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.