19Abija chụkwara Jeroboam na ndị agha ya ọsọ dọta obodo ndị a nʼagha: Betel, na Jeshana, na Efrọn, na obodo niile gbara ha gburugburu.
20Jeroboam enwetakwaghị ike ya ọzọ oge niile Abija nọ dịka eze. Ma ọ dịghị anya Onyenwe anyị tidara ya tigbuo ya.
21Ma Abija gara nʼihu bụrụ onye dị ike, ọ lụrụ nwunye iri na anọ, mụọ iri ụmụ nwoke abụọ na abụọ, na ụmụ ndị nwanyị iri na isii.
22Akụkọ niile banyere ọchịchị Abija, ihe o mere na ihe o kwuru, dị nʼakwụkwọ akụkọ nke Ido onye amụma dere.