2 Ihe E Mere 13

Ma Jeroboam, nwa Nebat, bụ onye ọrụ Solomọn nwa Devid, nupuru isi megide onyenwe ya.

2 Chronicles 13:6 (UKJV) Yet Jeroboam the son of Nebat, the servant of Solomon the son of David, has risen up, and has rebelled against his lord.

4Abija guzoro nʼugwu Zemaraim nʼala ugwu ugwu Ifrem jiri oke olu sị “Jeroboam na ndị Izrel niile geenụ m ntị!

5Unu amataghị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel esitela nʼọgbụgba ndụ nnu nyefee ọchịchị ala Izrel niile nʼaka Devid na ụmụ ụmụ ya ruo ebighị ebi?

6Ma Jeroboam, nwa Nebat, bụ onye ọrụ Solomọn nwa Devid, nupuru isi megide onyenwe ya.

7Ndị efu niile na-abaghị uru chịkọtara onwe ha gbaa ya gburugburu guzogide Rehoboam nwa Solomọn, mgbe ọ bụ nwantakịrị na onye na-enweghị ike inwe mkpebi, onye nʼadịghịkwa ike iguzogide ha.

8“Ma ugbu a, unu ejikerela imegide alaeze Onyenwe anyị nke dị nʼaka ụmụ ụmụ Devid. Nʼezie, unu bu igwe ndị agha bara ụba, nʼetiti unu ka ụmụ ehi ọlaedo ahụ dịkwa, bụ nke Jeroboam mere ka ha buru chi unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.