13O nwekwara ihe ndị ọ chịkọbara nʼọtụtụ obodo Juda. O debekwara ndị agha ibu agha doro anya nʼime Jerusalem.
14Ngụkọta ha dịka e si dekọọ ya nʼezinaụlọ si dị: Ndị si Juda, ndịisi agha na-achị puku ndị agha (1,000), Adna, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha atọ (300,000),
15onye na-eso ya bụ Jehohanan, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha abụọ na iri puku asatọ (280,000),
16ọzọ, Amasiya nwa Zikri, onye ji afọ ofufu nye onwe ya maka ọrụ Onyenwe anyị, na-achị narị puku ndị agha abụọ (200,000).
17Ndị si Benjamin, Eliada, dimkpa nʼagha, na-achị narị puku ndị agha abụọ (200,000), ndị ji akụ na ụta, na ọta ebu agha.