2 Ihe E Mere 20

Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, Onyenwe anyị cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha.

2 Chronicles 20:22 (UKJV) And when they began to sing and to praise, the LORD set ambushments against the children of Ammon, Moab, and mount Seir, which were come against Judah; and they were smitten.

20Nʼisi ụtụtụ, ha pụrụ gawa nʼọzara Tekoa. Ma mgbe ha na-apụ, Jehoshafat guzoro ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem. Nweenụ okwukwe nʼime Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nwekwanụ ntụkwasị obi na ige ndị amụma ya ntị, ka ihe gaara unu nke ọma.”

21Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too Onyenwe anyị nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị: “Nyenụ Onyenwe anyị ekele, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.”

22Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, Onyenwe anyị cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha.

23Ma ndị agha Amọn na Moab buru ụzọ lụso ndị agha si nʼugwu Sia ọgụ. Mgbe ha lakwara onwe ha nʼiyi, ọgụ dakwara nʼetiti ndị Moab na Amọn.

24Mgbe ndị agha Juda rutere ebe ha ga-esi lepụ anya hụ ihe na-eme nʼọzara ahụ, ha lepụrụ anya ịhụ usuu ndị agha ahụ, ma ihe ha hụrụ bụ ozu ndị agha tọgbọcha nʼala. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị agha ahụ gbapụrụ na ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.