3Jehoshafat tụrụ egwu nke ukwuu, kpebiekwa ịchọ inyeaka Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, ọ kpọsara obubu ọnụ nye ndị Juda niile.
4Ndị Juda zukọtara ịchọ inyeaka Onyenwe anyị; nʼezie, ha sitere nʼobodo niile nke Juda bịa ịchọ ihu Onyenwe anyị.
5Mgbe ahụ, Jehoshafat guzoro nʼetiti nzukọ ndị Juda na Jerusalem nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ogige ọhụrụ ahụ,
6sị; “O Onyenwe anyị, Chineke nna nna anyị ha, ọ bụghị gị bụ Chineke onye bi nʼeluigwe? Ọ bụkwa gị na-achị alaeze niile nke mba dị iche iche. Ike na ume dị nʼaka gị, ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzogide gị.
7O Chineke anyị, ọ bụghị gị onwe gị chụpụrụ ndị bi nʼala, site nʼihu ndị gị Izrel, were ya nye ụmụ ụmụ Ebraham, bụ enyi gị nwoke?