2 Ihe E Mere 29

Aja nsure ọkụ bara ụba, tinyere abụba nke aja udo niile, na aja ihe ọṅụṅụ nke so aja nsure ọkụ ndị a. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si weghachite ije ozi na ịchụ aja nke na-adị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

2 Chronicles 29:35 (UKJV) And also the burnt offerings were in abundance, with the fat of the peace offerings, and the drink offerings for every burnt offering. So the service of the house of the LORD was set in order.

33Anụ ndị e doro nsọ maka ịchụ aja dị narị oke ehi isii na atụrụ na ewu dị puku atọ.

34Ma ndị nchụaja dị ole na ole, ha apụghịkwa ịgba akpụkpọ anụ niile ahụ maka aja nsure ọkụ, nʼihi ya, ụmụnne ha bụ ndị Livayị nyeere ha aka tutu ruo mgbe ozi ahụ gwụsịrị, ruokwa mgbe e doro ndị nchụaja ndị ọzọ nsọ. Nʼihi na ndị Livayị nwere obi ziri ezi karịa ndị nchụaja ido onwe ha nsọ.

35Aja nsure ọkụ bara ụba, tinyere abụba nke aja udo niile, na aja ihe ọṅụṅụ nke so aja nsure ọkụ ndị a. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si weghachite ije ozi na ịchụ aja nke na-adị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

36Hezekaya na ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ihe Chineke doziri nye ndị ya, nʼihi na ihe niile ndị a mere ngwangwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.