2 Ihe E Mere 29

Ha mechikwara ụzọ ndị e si abanye na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, menyụọkwa ọkụ dị nʼime ya. E sureekwaghị ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ọ dịkwaghị aja nsure ọkụ ọbụla a chụrụ nye Chineke nke Izrel.

2 Chronicles 29:7 (UKJV) Also they have shut up the doors of the porch, and put out the lamps, and have not burned incense nor offered burnt offerings in the holy place unto the God of Israel.

5gwa ha okwu sị ha, “Geenụ m ntị unu ndị Livayị, doonụ onwe unu nsọ, dokwaanụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nsọ. Wezuganụ ihe arụ niile dị nʼebe nsọ nke ụlọnsọ ahụ.

6Nʼihi na nna anyị ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi; ha mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, hapụ ya. Ha wepụrụ ihu ha site nʼebe obibi Onyenwe anyị, gbakụtakwa ya azụ.

7Ha mechikwara ụzọ ndị e si abanye na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, menyụọkwa ọkụ dị nʼime ya. E sureekwaghị ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ọ dịkwaghị aja nsure ọkụ ọbụla a chụrụ nye Chineke nke Izrel.

8Nʼihi nke a ka iwe Onyenwe anyị ji dakwasị Juda na Jerusalem. O meela ka ha buru ihe oke egwu, na oke ihere na oke ụjọ, dịka unu jirila anya unu hụ.

9E gburu nna anyị ha nʼagha, dọtakwa ndị nwunye anyị na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị nʼagha nʼihi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.