2 Ihe E Mere 30

Eze na ndịisi ya, na ndị nkpọkọta niile na Jerusalem kpebiri na Mmemme Ngabiga a ga-adị nʼọnwa nke abụọ.

2 Chronicles 30:2 (UKJV) For the king had taken counsel, and his princes, and all the congregation in Jerusalem, to keep the passover in the second month.

1Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.

2Eze na ndịisi ya, na ndị nkpọkọta niile na Jerusalem kpebiri na Mmemme Ngabiga a ga-adị nʼọnwa nke abụọ.

3Ha enweghị ike ime ya nʼoge e kwesiri ime ya nʼihi na ọtụtụ ndị nchụaja enwebeghị ike doo onwe ha nsọ nʼọnwa ahụ. Otu a kwa, ndị Izrel enwebeghịkwa ike zukọtaa na Jerusalem.

4Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.