24Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ.
25Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa.
26Oke ọṅụ jupụtara na Jerusalem nʼihi na site nʼoge Solomọn nwa Devid, eze Izrel ruo nʼoge a, e mebeghị mmemme dị otu a na Jerusalem.
27Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị Livayị guzoro gọzie ọha mmadụ ahụ niile. Chineke nụkwara ekpere ha site nʼebe obibi ya dị nsọ nke eluigwe.