3Ha enweghị ike ime ya nʼoge e kwesiri ime ya nʼihi na ọtụtụ ndị nchụaja enwebeghị ike doo onwe ha nsọ nʼọnwa ahụ. Otu a kwa, ndị Izrel enwebeghịkwa ike zukọtaa na Jerusalem.
4Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a.
5Ha kpebiri ka e kwusaa nʼala Izrel niile site na Dan ruo na Bịasheba ka onye ọbụla bịa na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Ọtụtụ mmadụ nʼIzrel esobeghị mee mmemme a dịka e nyere ya nʼiwu.
6Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si: “Unu ndị Izrel, lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ka ọ laghachikwute unu bụ ndị eze Asịrịa na-emeribeghị.
7Unu adịkwala ka nna unu ha, na ụmụnne unu ndị Izrel, ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ha, nke a mere o jiri were ha mee ihe iju anya, dịka unu hụrụ ya.