2 Ihe E Mere 31

Ndị a bụ ihe ndị Hezekaya mere nʼime Juda niile, ọ na-eme ihe dị mma, na nke ziri ezi, nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke ya.

2 Chronicles 31:20 (UKJV) And thus did Hezekiah throughout all Judah, and wrought that which was good and right and truth before the LORD his God.

18Ndị na-esokwa keta oke ndị a bụ ụmụntakịrị, na ndị inyom, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom na-etolite etolite, bụ ndị niile e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ndị a bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼido onwe ha nsọ.

19A họpụtara ụfọdụ ndị ikom ndị ọrụ ha bụ ike nri nye ndị nchụaja niile bụ ụmụ ụmụ Erọn. Ndị nchụaja a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a bụ ndị ahụ bi nʼala ubi nke gbara obodo ndị nchụaja gburugburu, maọbụ ndị bi nʼobodo ndị ọzọ. Ndị a bụkwa ndị e dere aha ha niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ndị Livayị.

20Ndị a bụ ihe ndị Hezekaya mere nʼime Juda niile, ọ na-eme ihe dị mma, na nke ziri ezi, nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke ya.

21Nʼime ihe niile o mere, nke metụtara ije ozi nke ụlọ ukwu Chineke, na idebe iwu niile na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere, Hezekaya ji obi ya niile gbasoo Chineke. O jikwa obi ya niile jee ozi niile o jere. Nke a mekwara ka ihe gaara ya nke ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.