2 Ihe E Mere 6

biko, site nʼeluigwe nụrụ ekpere ha, gbaghara mmehie ndị gị Izrel. Meekwa ka ha lọghachita nʼala ahụ nke i nyere ha na nna nna ha.

2 Chronicles 6:25 (UKJV) Then hear you from the heavens, and forgive the sin of your people Israel, and bring them again unto the land which you gave to them and to their fathers.

23mgbe ahụ, nụrụ olu ya nʼeluigwe ma mee ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe nʼetiti ndị ohu gị. Maa onye mejọrọ ikpe site nʼịtụkwasị nʼisi ha ihe o metara, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya, site nʼimeso ha dịka ezi omume ha si dị.

24“Mgbe ndị iro meriri ndị gị Izrel, nʼihi na ha mehiere megide gị, ọ bụrụ na ha alọghachite, too aha gị, na-ekpe ekpere, na-arịọ arịrịọ nʼihu gị nʼụlọnsọ ukwu a,

25biko, site nʼeluigwe nụrụ ekpere ha, gbaghara mmehie ndị gị Izrel. Meekwa ka ha lọghachita nʼala ahụ nke i nyere ha na nna nna ha.

26“Mgbe e gbochiri eluigwe, mee na mmiri adịghị ezokwa, nʼihi na ndị gị emehiela megide gị, ọ bụrụ na ha echee ihu nʼebe a kpee ekpere, too aha gị, si na mmehie ha chegharịa, nʼihi na ịtaala ha ahụhụ,

27biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, ndị gị Izrel. Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.