3Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha.
4Mgbe ahụ ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye ji aka ya abụọ mezuo nkwa ahụ o ji ọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị,
5‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ, maọbụ họpụta onye ọbụla ka ọ bụrụ onyendu ndị m Izrel.
6Ma ugbu a, a họrọla m Jerusalem ka ọ bụrụ ebe Aha m ga-adị, ahọrọkwala m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’
7“Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.