2 Ihe E Mere 7

Mgbe ọha ndị Izrel niile hụrụ ọkụ ahụ si nʼelu daa, hụkwa ebube Onyenwe anyị ka o guzo nʼelu ụlọnsọ ukwu ahụ, ha dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị, kelee ya ekele sị: “Nʼihi na Ọ dị mma ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”

2 Chronicles 7:3 (UKJV) And when all the children of Israel saw how the fire came down, and the glory of the LORD upon the house, they bowed themselves with their faces to the ground upon the pavement, and worshipped, and praised the LORD, saying, For he is good; for his mercy endures for ever.

1Ngwangwa, mgbe Solomọn kpesịrị ekpere a, ọkụ sitere nʼeluigwe daa repịa aja nsure ọkụ ahụ na aja ahụ niile. Ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼụlọnsọ ukwu ahụ,

2Ndị nchụaja enweghị ike ịbanye nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼihi ebube Onyenwe anyị nke jupụtara ụlọnsọ ahụ.

3Mgbe ọha ndị Izrel niile hụrụ ọkụ ahụ si nʼelu daa, hụkwa ebube Onyenwe anyị ka o guzo nʼelu ụlọnsọ ukwu ahụ, ha dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị, kelee ya ekele sị: “Nʼihi na Ọ dị mma ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”

4Mgbe ahụ, eze na ndị a niile chụrụ aja dị iche iche nʼihu Onyenwe anyị.

5Eze Solomọn chụrụ aja ehi nke dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri abụọ. Ya mere, Eze na ndị ahụ niile si otu a doo ụlọnsọ Chineke nsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.