2 Ihe E Mere 8

Mgbe ahụ, Solomọn gara Eziọn Geba na Elat nke dị nʼọnụ osimiri, nʼala Edọm.

2 Chronicles 8:17 (UKJV) Then went Solomon to Eziongeber, and to Eloth, at the sea side in the land of Edom.

15Ha ewezugaghị onwe ha nʼiso iwu niile eze nyere ndị nchụaja maọbụ ndị Livayị banyere ihe ọbụla na ihe gbasakwara ụlọakụ niile.

16A rụzuru ọrụ niile Solomọn zubere ịrụ, site nʼụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị tutu ruo mgbe ewuchara ya. Ya mere, e wuchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

17Mgbe ahụ, Solomọn gara Eziọn Geba na Elat nke dị nʼọnụ osimiri, nʼala Edọm.

18Hiram zigaara ya ọtụtụ ụgbọ mmiri nke ndị ikom ya na-anya ụgbọ mmiri na-edu, bụ ndị maara ihe banyere ime njem nʼosimiri nke ọma. Ndị a, ha na ndị ikom Solomọn nyaara ụgbọ gaa Ọfịa site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn, ọlaedo ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na ise na narị atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.