1Pọl, onyeozi nke Jisọs Kraịst dịka ọchịchọ nke Chineke si dị, na Timoti nwanne anyị nwoke, Na-edegara chọọchị Chineke nke dị na Kọrint, na ndị nsọ niile ndị nọ nʼala Akaịa akwụkwọ:
2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
3Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile.