2 Ndị Kọrint 1

Ọ bụ Chineke bụ onye zọpụtara anyị site nʼime oke ọnwụ dị otu a. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nʼihu na-azọpụtakwa anyị,

2 Corinthians 1:10 (UKJV) Who delivered us from so great a death, and does deliver: in whom we trust that he will yet deliver us;

8Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ.

9Nʼezie, ọ dị nnọọ nʼoge ahụ, dịka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesighị ka anyị tụkwasị obi nʼike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nʼime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie.

10Ọ bụ Chineke bụ onye zọpụtara anyị site nʼime oke ọnwụ dị otu a. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nʼihu na-azọpụtakwa anyị,

11dịka unu ga-enyekwara anyị aka site nʼekpere unu, ka ọtụtụ nwere ike nye ekele nʼihi anyị maka onyinye amara anyị natara na nzaghachi ekpere ọtụtụ mmadụ ndị a na-ekpere anyị.

12Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.