12Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ.
13Nʼihi na ihe anyị na-edere unu abụghị ihe unu na agaghị agụta maọbụ ghọta. Enwere m nchekwube na unu ga-aghọta ya nke ọma.
14Dịka unu ghọtarala anyị nwa nke nta ugbu a, unu ga-eji anyị anya isi nʼụbọchị nke Onyenwe anyị Jisọs.
15Ihe m na-ekwu were m anya, nke mere m ji chọọ ibu ụzọ bịa leta unu ka unu nwee uru abụọ.
16Ebu m ya nʼobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nʼobi m na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judịa.