8Nʼihi na anyị apụghị ime ihe ọbụla megide eziokwu, kama anyị na-eme ihe niile nʼihi eziokwu.
9Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị na-adịghị ike ma hụ na unu dị ike. Ihe anyị na-arịọ Chineke bụ ka unu tozuo oke.
10Ana m edere unu akwụkwọ a ugbu a, nʼihi na-achọghị m ịbara unu mba na inye unu ntaramahụhụ mgbe m bịara. Achọkwaghị m iji ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nye unu ntaramahụhụ, kama achọrọ m iji ya wulie unu elu dịka ụlọ.
11Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.
12Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.