2 Ndị Kọrint 13

Mgbe m bịara leta unu nke ugboro abụọ, abaara m ndị niile dara iwu nʼoge gara aga na mmadụ ndị ọzọ mba, dọọkwa ha aka na ntị, ihu na ihu. Ugbu a m na-anọghị ya, ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ọ bụrụ na m bịa ọzọ hụ na ndị mehiere na mbụ echegharịghị, aga m emesi ha ike.

2 Corinthians 13:2 (UKJV) I told you before, and foretell you, as if I were present, the second time; and being absent now I write to them which in time past have sinned, and to all other, that, if I come again, I will not spare:

1Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Ọ bụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara ka a ga-eme ka okwu niile guzoro.

2Mgbe m bịara leta unu nke ugboro abụọ, abaara m ndị niile dara iwu nʼoge gara aga na mmadụ ndị ọzọ mba, dọọkwa ha aka na ntị, ihu na ihu. Ugbu a m na-anọghị ya, ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ọ bụrụ na m bịa ọzọ hụ na ndị mehiere na mbụ echegharịghị, aga m emesi ha ike.

3Ebe unu chọrọ ka e gosi na Kraịst na-ekwu okwu nʼime m, ọ dịghị egosi adịghị ike mgbe ọ na-emeso unu omume, kama ọ na-eme ka ike ya pụta ìhè nʼebe unu nọ.

4Ọ bụ ezie na a kpọgidere ya na-adịghị ike, ma ugbu a, ọ na-adị ndụ site nʼike dị ukwuu nke Chineke. Anyị bụkwa ndị na-adịghị ike nʼime ya, ma ozi anyị na-ejere unu na mmekọrịta anyị na unu, anyị ga-eso ya dị ndụ site nʼike nke Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.