2 Ndị Kọrint 13

Enwere m olileanya na unu niile ga-achọpụta na anyị adaghị ule ahụ.

2 Corinthians 13:6 (UKJV) But I trust that all of you shall know that we are not reprobates.

4Ọ bụ ezie na a kpọgidere ya na-adịghị ike, ma ugbu a, ọ na-adị ndụ site nʼike dị ukwuu nke Chineke. Anyị bụkwa ndị na-adịghị ike nʼime ya, ma ozi anyị na-ejere unu na mmekọrịta anyị na unu, anyị ga-eso ya dị ndụ site nʼike nke Chineke.

5Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu nyochaa onwe ya, tulekwa omume ya, mara ma ọ ka kwudosiri ike nʼokwukwe ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na Jisọs Kraịst nọ nʼime unu? Ma ọ bụghị na unu enyochaala onwe unu hụ na unu emeghị nke ọma.

6Enwere m olileanya na unu niile ga-achọpụta na anyị adaghị ule ahụ.

7Ma anyị na-arịọ Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọbụla. Anyị anaghị eme nke a iji gosi na anyị kwesiri ekwesi, kama ka unu nwee ike mee ihe dị mma, nʼagbanyeghị na ọ ga-adị ka a ga-asị na anyị emeghị nke ọma nʼọrụ anyị.

8Nʼihi na anyị apụghị ime ihe ọbụla megide eziokwu, kama anyị na-eme ihe niile nʼihi eziokwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.