11Ọ bụrụ na ihe na-agafe agafe nwere ebube dị otu a, ihe ga-anọgide mgbe niile ga-enwe ebube karịa ya.
12Ya mere, ebe ọ bụ na anyị nwere olileanya dị otu a, anyị enweghị egwu ọbụla.
13Anyị agaghị adị ka Mosis onye weere akwa kpuchie ihu ya, nʼihi na ọ chọghị ka ụmụ Izrel hụ ebube ahụ na-agbanwe agbanwe.
14Kama e mechiri obi ha ruo taa. Nʼihi na mgbe ọbụla ha gụrụ akwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie ahụ, akwa mkpuchi ahụ na-anọgidekwa apụghị apụ nʼobi ha, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼime Kraịst ka ọ ga-eji pụọ.
15Ee, tutu ruo taa, mgbe ọbụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosis dere, ihe mkpuchi na-adịgide nʼobi ha.